Music Live Video

uwa bu ahia – patty obassey


Download uwa bu ahia by patty obassey mp3 A nice Nigerian Gospel Music now available for Download only at gospeldayz.com

 

 

 

Stream and Download below 

 

Download mp3

 

 

 

 

Uwa bu ahia Lyrics

 

Obim Sara mbara ito onye nwe anyi
Obim Sara mbara ito yaa
Messiah nuru onu m Zara mu ekpere
Mgbe oge ruru akwa mgbochi wee keewa
O Zara mu ekpere
Uwa bu ahia
Onye biara uwa cheta onye kere ya
Ahia zuchaa wuruwuru ogbasa
Ka anyi cheta na nwa nke mmadu bu ulo
Jehova kpuchara kunye ya ume
O wee buru onye e kere eke
Ulo akpuru puru Ida waa
Jehova were ume okunyere mmadu anwuo
Oburu onye nwuru anwu
Uwa bu ahia
Onye biara uwa Mara ihe aturu gi
Ahia zuchaa wuruwuru ogbasaa
Uwa efere nkuwa
John the Baptist n’ulo nkporo juru ajuju
Ajuju n’egosi ida Mba okwukwe
Owute chukwu
Nime ndum Nile
Agam n’eto ya chim nwe mmeri
Onye iro apughi iri otito na ndu mu o
Lee Paul na Silas, ha ji Ibu abu nwe mmeri
Jehova nye ha mmeri
Jesus wee nye ha mmeri
Nime ndu Nile
Agam n’eto ya, chim nwe mmeri
Muo nso puru ime onodu ogbanwe
Uwa bu ahia
Ya bu ije enu uwa bu Ahia mgbede
Ahia zuchaa wuruwuru ogbasaa
Uwu efere nkuwa
Uwa bu ahia
Ije enu uwa o yiri ebe abiara egwu
Ozuchaa wuruwuru ogbasa
Messiah ji ndu nukwa onu m
Gbawara ya egwu
Muo ya puru ime onodu ogbanwe
Kuwara ya aka
Guzoro fufere ya aka, Ibu onye ngozi
Mgbe oge ruru onodu agbanwe, Gbawara ya egwu
Obi m Sara mbara ito onye nwe anyi
Obu ya mere ndi ufodu ocha
Kee ndi ufodu oji
Omee otutu ha di mkpu-mkpu ufodu Kara ogologo
Nani ya Mataram ihe oji di otua
Inwere ajuju?
Ulo akpuru atu n’eku ume inwere ajuju?
Ihe kpatara o ji di otua
Inwere nkwuwa okwu?
Uwa bu ahia
Ya bu ije enu uwa oyi gi ebe abiara egwu
O zuchaa wuruwuru ogbasa
Ulo akpuru akpu n’eme iyanga
Ulo akpuru akpu puru Ida waa, efere nkuwa
Ulo akpuru akpu n’eku ume, imara na chukwu?
Onye kechara gi kunye gi ume, efere nkuwa
Uwa bu ahia
Ya bu ije enu uwa bu ahia mgbede
Ahia zuchaa wuruwuru ogbasa
(Fades out)

 

 

 

Thanks

Share On:

TAGS:



CLICK HERE TO PROMOTE YOUR MUSIC/VIDEO
Related Posts
 


0 Responses

Leave a Reply